20 Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.
21 Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:
22 N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,Jehova gākwughachi kwa gi.
23 Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.
24 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
25 Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà,Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di.
26 Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibiKa onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.