1 Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi,Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.
2 Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya,Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.
3 Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.
4 Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.
5 Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.