16 Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.
17 Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.
18 Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,Na àkú, na ọnwu;
19 Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?
20 Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.
21 Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di;Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.
22 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.