23 Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọchaKa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.
24 Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua,Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:
25 Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya;N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.
26 Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya,Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.
27 Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà:Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.
28 Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì;Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.