8 Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.
9 Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.
10 Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.
11 Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.
12 Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;Ọdum di n'amá.
14 Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya,Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.