1 Anyala isi bayere echi;N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.
2 Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi;Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.
3 Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú;Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.
4 Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa;Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?