1 Anyala isi bayere echi;N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.
2 Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi;Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.
3 Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú;Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.
4 Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa;Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?
5 Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè,Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe.
6 Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu:Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.