12 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.
13 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
14 Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya,Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.
15 Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo,Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:
16 Onye nēzobe ya ezobewo ifufe,Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.
17 Ígwè nāmucha ígwè;Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.
18 Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.