14 Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya,Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.
15 Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo,Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:
16 Onye nēzobe ya ezobewo ifufe,Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.
17 Ígwè nāmucha ígwè;Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.
18 Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.
19 Dika miri si eme ka iru hu iru,Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.
20 Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì;Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.