22 Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu,Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.
23 Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma,Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile:
24 N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di;Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile?
25 Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu,Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.
26 Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi,Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa: