5 Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè,Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe.
6 Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu:Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.
7 Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi:Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.
8 Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu,Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu.
9 Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria:Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.
10 Arapula eyì-gi na eyì nna-gi;Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi:Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya.
11 Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria,Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu.