19 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.
20 Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi:Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
21 Imata iru madu n'ikpé adighi nma:Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.
22 Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.
23 Onye nābara madu nba gēmesia huta amaraKari onye nēkwu ire-utọ.
24 Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.
25 Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu:Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.