5 Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.
6 Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.
7 Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.
8 Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.
9 Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.
10 Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.
11 Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.