11 Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:
12 N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.
13 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,Ya na madu nke nēnweputa nghọta.
14 N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.
15 Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.
16 Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.
17 Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.