19 Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.
20 Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.
21 Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;
22 Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.
23 Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,
24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.
25 Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia: