22 Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.
23 Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,
24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.
25 Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:
26 N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.
27 Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.
28 Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.