28 Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.
29 Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.
30 Gi na madu esela okwu n'efu,Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.
31 Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.
32 N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.
33 Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu;Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.
34 Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.