1 Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya.Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal.
2 N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula,Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere
3 Amutaghkwam amam-ihe,Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara.
4 Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida?Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua?Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya?Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike?Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?
5 Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo:Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.
6 Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile,Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.
7 Ihe abua ka m'riọworo Gi;Ajulam ha tutu mu anwua: