1 Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.
2 Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?
3 Enyela ndinyom ike-gi,Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.
4 Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?
5 Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.
6 Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine: