10 Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.
11 Obi di-ya atukwasiwo ya obi,Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.
12 Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,Ubọchi nile nke ndu-ya.
13 Ọ chọwo aji-anu na flax,We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.
14 Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.
15 O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,We nye ulo-ya nri,Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.
16 O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.