17 O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké,Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.
18 Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.
19 Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho,Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.
20 Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala;E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.
21 Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.
22 Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.
23 Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.