21 Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.
22 Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.
23 Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.
24 Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.
25 Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.
26 Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe;Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.
27 Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.