23 Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.
24 Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.
25 Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.
26 Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe;Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.
27 Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.
28 Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma;Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:
29 Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma,Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.