10 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;
11 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe,Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.
12 Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;
13 O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.
14 Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:Ọ nēzisa ise-okwu.
15 N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
16 Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya: