16 Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:
17 Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;
18 Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;
19 Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.
20 Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
21 Hie ha n'obi-gi mb͕e nile,Ke ha n'olu-gi.
22 Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.