22 Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.
23 N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:
24 Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ,N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.
25 Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi;Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.
26 N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.
27 Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?
28 Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?