3 Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi,N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi;Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.
4 Enyela anya-gi abua ura,Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.
5 Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá,Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.
6 Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu;Le uzọ-ya nile, we mara ihe:
7 Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,
8 Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku,Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.
9 Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu?Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?