8 Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku,Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.
9 Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu?Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?
10 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;
11 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe,Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.
12 Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;
13 O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.
14 Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:Ọ nēzisa ise-okwu.