15 Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya:Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
16 Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya:Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
17 Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume,Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
18 O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha:Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
19 Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi:Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.
20 Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ:Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.
21 Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume:Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.