1 Madu nwe ido obi n'usoro:Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.
2 Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya:Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.
3 Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru,Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.
4 Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya:E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.
5 Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu:Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6 Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume:Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
7 Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.