4 Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya:E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.
5 Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu:Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6 Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume:Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
7 Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.
8 Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume,Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.
9 Obi madu nēchè uzọ-ya:Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.
10 Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze:Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.