18 Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi,Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.
19 Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike:Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.
20 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula;N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.
21 Ọnwu na ndu di ire n'aka;Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
22 Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
23 Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu:Ma ọgaranya nāza ike ike.
24 Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya:Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.