12 Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;
13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;
14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;
15 Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:
16 Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;
17 Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:
18 N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.