16 Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;
17 Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:
18 N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.
19 Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:
20 Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma,Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.
21 N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa,Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.