16 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
17 Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha;Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.
18 Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike:Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.
19 O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ.Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu.
20 Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya,Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.
21 Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu;Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya.
22 Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ:Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.