20 Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya,Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.
21 Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu;Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya.
22 Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ:Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.
23 Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu;Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma.
24 N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite;Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya?
25 Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ,Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.
26 Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe,Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha.