18 Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.
19 Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara,Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.
20 Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe;Ma madu nzuzu nēloda ya.
21 Onye nāb͕aso ezi omume na ebereNāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.
22 Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo,O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.
23 Onye nēdebe ọnu-ya na ire-yaNēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
24 Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya,Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.