17 Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo:Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.
18 N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi;Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
19 Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe,Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.
20 Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè;N'etiti ndi nēribiga anu ókè:
21 N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
22 Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
23 Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.