21 N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
22 Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
23 Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.
24 Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.
25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
26 Nwam, nyem obi-gi,Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
27 N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.