9 Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie:Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.
10 Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu,Ike-gi pere npe.
11 Naputa ndi anāchigara ọnwu,Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.
12 Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a:Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta?Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama?Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?
13 Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma;Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:
14 Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi:Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
15 Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume;Apunarala ya ebe-izu-ike-ya: