11 Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọchaKa okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.
12 Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọmaKa onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.
13 Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi,Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya;Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.
14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.
15 Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.
16 Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.
17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi;Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.