14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.
15 Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.
16 Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.
17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi;Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.
18 Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọKa onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.
19 Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapuKa itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.
20 Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.