15 Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe:Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.
16 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari:Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.
17 Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.
18 Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.
19 Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.
20 Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
21 Onye zutọworo orù-ya site na nwata,N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.