17 Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.
18 Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.
19 Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.
20 Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
21 Onye zutọworo orù-ya site na nwata,N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.
22 Onye-iwe nākpali ise-okwu,Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.
23 Npako madu gēme ka ọ di ala:Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.