2 Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.
3 Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.
4 Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:Ma onye nānara onyinye nākwada ya.
5 Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.
6 Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.
7 Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.
8 Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.