14 Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nileN'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.
15 Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi,Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.
16 Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí?Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?
17 Ka ha diri nání gi onwe-gi,Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.
18 Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi;Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.
19 Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma,Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile;Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.
20 Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam?N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?