6 Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari:Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.
7 Ma ub͕u a, umum, gēnum nti,Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.
8 Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ,Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:
9 Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi,Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:
10 Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi;Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;
11 I we sua udè n'ikpe-azu-gi,Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,
12 I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;