9 Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi,Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:
10 Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi;Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;
11 I we sua udè n'ikpe-azu-gi,Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,
12 I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;
13 Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim,Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!
14 Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nileN'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.
15 Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi,Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.