Job 10 IGBOB

1 Ike ndum agwuwo nkpuru-obim;Ka m'rapuru onwem ntamum;Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

2 M'gāsi Chineke, Amalam ikpe;Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.

3 Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u,Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua,We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?

4 Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?

5 Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di?Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,

6 Na I nāchọ ajọ omumem,Nāju kwa ase nmehiem?

7 Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu;Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.

8 Aka-Gi dozirim, we kpuamKa m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.

9 Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?

10 Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,Me ka m'raru araru dika cheese?

11 Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.

12 Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.

13 Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;Amawom na nka di n'aka-Gi:

14 Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.

15 Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu;Ebe nlelìm juworom afọ,Ya na ilekwasi nwedam anya.

16 Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.

17 I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum,Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ;Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.

18 N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.

19 Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi;Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.

20 Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa,Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,

21 Tutu alam, ghara kwa ilaghachi,Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42