1 Ike ndum agwuwo nkpuru-obim;Ka m'rapuru onwem ntamum;Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
2 M'gāsi Chineke, Amalam ikpe;Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.
3 Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u,Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua,We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?
4 Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere,Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?
5 Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di?Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,
6 Na I nāchọ ajọ omumem,Nāju kwa ase nmehiem?
7 Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu;Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.
8 Aka-Gi dozirim, we kpuamKa m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.
9 Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom;Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?
10 Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim,Me ka m'raru araru dika cheese?
11 Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim,Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.
12 Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe,Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.
13 Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi;Amawom na nka di n'aka-Gi:
14 Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya,I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.
15 Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim;Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu;Ebe nlelìm juworom afọ,Ya na ilekwasi nwedam anya.
16 Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám:I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.
17 I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum,Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ;Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.
18 N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta?M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.
19 Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi;Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.
20 Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa,Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,
21 Tutu alam, ghara kwa ilaghachi,Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;