Job 6 IGBOB

1 Job we za, si,

2 Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma,Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!

3 N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile:N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.

4 N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem,Nke ńsí-ha ka mọm nāṅuIhe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.

5 Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu?Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?

6 Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya?Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?

7 Ihe nkpuru-obim nāju imetu,Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.

8 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia;Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!

9 Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam;Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.

10 Nkasi-obim we nādiru ub͕u a;M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko:N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.

11 Gini bu ikem na m'gēche?Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?

12 Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu?Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?

13 Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem?Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?

14 Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya;Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.

15 Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi,Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;

16 Nke nēji nji n'ihi ice,Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:

17 Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu:Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.

18 Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha;Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.

19 Ndi-ije nke Tima legidere anya,Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.

20 Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi;Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.

21 N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe;Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.

22 Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe?Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?

23 Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u?Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?

24 Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti:Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.

25 Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè!Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?

26 Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba?Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.

27 Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà,Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.

28 Ma ub͕u a kwenu ichem iru;Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?

29 Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi;E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.

30 Ọ̀ di ajọ omume di n'irem?Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42